Native Bible

1 Kings 22:30 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Eze Izrel gwara Jehoshafat, sị, “Aga m ejikere onwe m dịka m bụ onye ọzọ banye nʼọgbọ agha, ma gị onwe gị yiri uwe eze gị.” Ya mere, eze Izrel nwogharịrị onwe ya ka onye ọzọ baa nʼọgbọ agha.

1 Kings 22:30 in English

1 Kings 22:30 · Berean Standard Bible

And the king of Israel said to Jehoshaphat, “I will disguise myself and go into battle, but you wear your royal robes.” So the king of Israel disguised himself and went into battle.

Context

28Maikaya kwupụtara sị, “Ọ bụrụ na ị lọghachi nʼudo, ọ pụtara na ọ bụghị Onyenwe anyị si nʼọnụ m kwuo okwu.” O kwukwara sị, “Unu niile hụbakwanụ okwu m ndị a niile ama!” 29Ya mere, eze Izrel na Jehoshafat eze Juda, pụrụ gawa Ramọt Gilead. 30Eze Izrel gwara Jehoshafat, sị, “Aga m ejikere onwe m dịka m bụ onye ọzọ banye nʼọgbọ agha, ma gị onwe gị yiri uwe eze gị.” Ya mere, eze Izrel nwogharịrị onwe ya ka onye ọzọ baa nʼọgbọ agha. 31Ma eze Aram enyelarị ndị ọchịagha ndị na-agba ụgbọ agha, ọnụọgụgụ ha dị iri atọ na abụọ, iwu sị, “Unu ebusola onye ọbụla agha, maọbụ onye ukwu maọbụ onye nta, karịakwa naanị eze Izrel.” 32Mgbe ndị ọchịagha, na-achị ụgbọ agha hụrụ Jehoshafat, ha chere nʼobi ha, “Nʼezie, onye a bụ eze Izrel.” Nʼihi ya ha tụgharịrị ibuso ya agha, ma Jehoshafat tiri mkpu,

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.