Native Bible

1 Kings 22:23 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“Ma ugbu a, Onyenwe anyị etinyela mmụọ okwu ụgha nʼọnụ ndị amụma gị niile ndị a. Onyenwe anyị ekwubiela nʼihe ọjọọ ga-adakwasị gị.”

1 Kings 22:23 in English

1 Kings 22:23 · Berean Standard Bible

So you see, the LORD has put a lying spirit in the mouths of all these prophets of yours, and the LORD has pronounced disaster against you.”

Context

21Nʼikpeazụ otu mmụọ pụtara, guzo nʼihu Onyenwe anyị sị, ‘Mụ onwe m ga-arafu ya.’ 22“ ‘Onyenwe anyị jụrụ sị, Olee otu ị ga-esi mee nke a?’ “ ‘Aga m apụ gaa bụrụ mmụọ nrafu nʼọnụ ndị amụma ya niile,’ ka ọ zara. “Onyenwe anyị sịrị, ‘Ị ga-enwe ike ịrafu ya. Gaa mee otu a.’ 23“Ma ugbu a, Onyenwe anyị etinyela mmụọ okwu ụgha nʼọnụ ndị amụma gị niile ndị a. Onyenwe anyị ekwubiela nʼihe ọjọọ ga-adakwasị gị.” 24Mgbe ahụ, Zedekaya nwa Kenaana, gara nso, maa Maikaya aka na nti, jụọ ya, “Olee ụzọ ka mmụọ ahụ sitere na Onyenwe anyị gara, mgbe ọ hapụrụ m bịa ịgwa gị okwu?” 25Maikaya zaghachiri, “Ị ga-achọpụta nke a nʼụbọchị ị ga-agbaba nʼime ime ụlọ izo onwe gị.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.