1 Ndị Eze 21:2
1 Kings 21:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ehab sịrị Nebọt, “Nye m ubi vaịnị gị ka ọ bụrụ ubi a gbara ogige, ebe m ga-akụ akwụkwọ nri, ebe ọ dị nso nʼụlọeze m. Aga m enye gị ubi vaịnị ọzọ dị mma karịa ya, ma ọ bụrụkwa na ị chọrọ, aga m akwụ gị ego ọbụla o ruru nʼọnụ ahịa ya.”
1 Kings 21:2 in English
1 Kings 21:2 · Berean Standard Bible
So Ahab said to Naboth, “Give me your vineyard to use as a vegetable garden, since it is next to my palace. I will give you a better vineyard in its place—or if you prefer, I will give you its value in silver.”
Context
1Mgbe nwa oge nta gasịrị, Nebọt, onye Jezril, nwere ubi vaịnị dị na Jezril, nʼakụkụ ụlọeze Ehab bụ eze Sameria.* 2Ehab sịrị Nebọt, “Nye m ubi vaịnị gị ka ọ bụrụ ubi a gbara ogige, ebe m ga-akụ akwụkwọ nri, ebe ọ dị nso nʼụlọeze m. Aga m enye gị ubi vaịnị ọzọ dị mma karịa ya, ma ọ bụrụkwa na ị chọrọ, aga m akwụ gị ego ọbụla o ruru nʼọnụ ahịa ya.” 3Ma Nebọt zara sị Ehab, “Ala a bụ ihe nketa ruuru m site nʼaka nna nna m ha. M ga-esi aṅaa nye gị ya. Onyenwe anyị ekwela na m ga-ewere ihe nketa nke nna nna m ha nye gị.” 4Ehab jiri obi ụfụ na ihu mgbarụ laa nʼụlọ ya nʼihi okwu a Nebọt, onye Jezril gwara ya, sị, “Agaghị m enye gị ihe nketa nna nna m ha.” O dinara nʼihe ndina ya, chee ihu ya nʼaja ụlọ, jụ iri ihe ọbụla.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.