Native Bible

1 Kings 20:31 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe ahụ, ndịisi agha ya bịakwutere ya sị ya, “Lee, anyị nụrụ na ndị eze Izrel bụ ndị obi ebere. Ka anyị yiri akwa mkpe nʼukwu anyị, kee ụdọ nʼolu anyị, gaa rịọọ eze Izrel. Ma eleghị anya ọ ga-edebe gị ndụ.”

1 Kings 20:31 in English

1 Kings 20:31 · Berean Standard Bible

Then the servants of Ben-hadad said to him, “Look now, we have heard that the kings of the house of Israel are merciful. Let us go out to the king of Israel with sackcloth around our waists and ropes around our heads. Perhaps he will spare your life.”

Context

29Ọ bụ ụbọchị asaa ka ha mara ụlọ ikwu ha na ncherita ihu ibe ha. Ma nʼụbọchị nke asaa ahụ, ndị agha malitere ibu agha. Ndị Izrel merụrụ narị puku ndị agha Aram ahụ nʼotu ụbọchị. 30Ma ndị fọdụrụ nʼetiti ndị agha Aram gbapụrụ ọsọ gbalaga nʼobodo Afek. Ebe ahụ ka mgbidi obodo Afek nọ dagbuo iri puku ndị agha abụọ na asaa nʼime ha. Ma Ben-Hadad nʼonwe ya gbalagara, gbaba nʼime obodo ahụ, gaa zoo onwe ya nʼime ime otu ụlọ. 31Mgbe ahụ, ndịisi agha ya bịakwutere ya sị ya, “Lee, anyị nụrụ na ndị eze Izrel bụ ndị obi ebere. Ka anyị yiri akwa mkpe nʼukwu anyị, kee ụdọ nʼolu anyị, gaa rịọọ eze Izrel. Ma eleghị anya ọ ga-edebe gị ndụ.” 32Ya mere, ha yikwasịrị onwe ha akwa mkpe, nyarakwa ụdọ nʼolu ha, jekwuru eze Izrel sị ya, “Ohu gị bụ Ben-Hadad na-asị, ‘Biko, kwee ka m dịrị ndụ.’ ” Eze jụrụ ha sị, “Ọ bụ ezie na ọ ka dị ndụ ugbu a? Nwanne m ka ọ bụ.” 33Okwu a mere ka ndị ozi eze Aram nwee olileanya. Ha mere ngwangwa kwugharịakwa ihe ahụ o kwuru. Ha sịrị, “E, Nwanne gị bụ Ben-Hadad.” Mgbe ahụ, eze Ehab nyere ha iwu sị, “Gaanụ kpọpụta ya, dutekwanụ ya nʼebe a.” Mgbe Ben-Hadad bịara, Ehab mere ka ọ rigota nʼụgbọ agha nke ya.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.