Native Bible

1 Kings 18:28 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ndị amụma a tiri mkpu nʼoke olu dịka ha si eme. Ha ji mma na ùbe na-egbukasị onwe ha ahụ, tutu ruo mgbe ọbara malitere isite ha nʼahụ na-agbapụta.

1 Kings 18:28 in English

1 Kings 18:28 · Berean Standard Bible

So they shouted louder and cut themselves with knives and lances, as was their custom, until the blood gushed over them.

Context

26Ya mere, ndị amụma Baal weere oke ehi ahụ e nyere ha doziekwa ya. Mgbe ahụ, ha kpọkuru aha Baal, chi ha. Site nʼụtụtụ tigide mkpu ruo nʼetiti ehihie na-asị “O Baal, biko, zaa anyị.” Ma o nweghị ihe ha nụrụ site nʼọnụ Baal. Ọ dịkwaghị onye zara ha. Ha malitere ite egwu gburugburu ebe ịchụ aja ahụ ha kwadoro. 27Nʼihe dị ka nʼetiti ehihie, Ịlaịja malitere ịchị ha ọchị, na ịkwa ha emo. Ọ gwara ha okwu sị ha, “Tisienụ mkpu ike ka Baal nwe ike ịnụ arịrịọ unu. Nʼezie, ọ bụ chi! Ma eleghị anya ọ nọ nʼoke echiche, maọbụ o ji ọrụ nʼaka, maọbụ ọ gara njem. Ma eleghị anya ọ na-arahụ ụra. Ọ chọrọ onye ga-akpọte ya.” 28Ndị amụma a tiri mkpu nʼoke olu dịka ha si eme. Ha ji mma na ùbe na-egbukasị onwe ha ahụ, tutu ruo mgbe ọbara malitere isite ha nʼahụ na-agbapụta. 29Ma mgbe etiti ehihie gasịrị, ha nọgidekwara na-ebu amụma ruo mgbe oge ịchụ aja uhuruchi ruru, ma o nweghị onye zara ha, o nwekwaghị olu a nụrụ. Ọ dịkwaghị onye ṅara ha ntị. 30Mgbe ahụ, Ịlaịja kpọrọ ndị Izrel sị ha, “Bịaruenụ m nso.” Ha niile bịaruru ya nso, o doziri ebe ịchụ aja Onyenwe anyị, bụ ndị ahụ a kwaturu nʼala na mbụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.