1 Ndị Eze 16:9
1 Kings 16:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe ahụ, Zimri, ọchịagha na-achị ọkara ụgbọala agha eze, gbara izuzu megide ya. Nʼoge a, Ela nọ na-aṅụ mmanya na Tịaza, nʼụlọ Aza, onye na-elekọta ụlọeze dị nʼobodo ahụ. Ọ ṅụkwara mmanya ahụ ṅụbiga ya oke.
1 Kings 16:9 in English
1 Kings 16:9 · Berean Standard Bible
However, while Elah was in Tirzah getting drunk in the house of Arza the steward of his household there, Elah’s servant Zimri, the commander of half his chariots, conspired against him.
Context
7Ma ozi Onyenwe anyị si nʼọnụ Jehu onye amụma, nwa Hanani bịara Baasha na ndị ezinaụlọ ya nʼihi ihe ọjọọ niile o mere, si otu a kpasuo Onyenwe anyị iwe. Ọ bụ ezie na ọ maara na Onyenwe anyị kpochapụrụ ezinaụlọ Jeroboam nʼihi ihe ọjọọ o mere, ma Baasha gara nʼihu mee ihe ọjọọ. 8Ela, nwa Baasha, malitere ịbụ eze Izrel nʼiri afọ abụọ na isii nke ịbụ eze Asa, eze Juda. Ma naanị afọ abụọ ka ọ chịrị dịka eze na Tịaza. 9Mgbe ahụ, Zimri, ọchịagha na-achị ọkara ụgbọala agha eze, gbara izuzu megide ya. Nʼoge a, Ela nọ na-aṅụ mmanya na Tịaza, nʼụlọ Aza, onye na-elekọta ụlọeze dị nʼobodo ahụ. Ọ ṅụkwara mmanya ahụ ṅụbiga ya oke. 10Zimri batara kụdaa ma gbukwaa ya. Ọ bụ nʼiri afọ abụọ na asaa nke ọchịchị Asa, eze Juda. Ọ bụụrụ eze nʼọnọdụ ya. 11Ngwangwa ọ ghọrọ eze, nọkwasị nʼocheeze ya, o gburu mmadụ niile nọ nʼezinaụlọ Baasha. Ọ hapụghị ọ bụladị otu nwoke. O gburu ikwu na ibe Baasha, na ndị enyi ya niile.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.