Native Bible

1 Kings 16:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Baasha sooro ndị nna nna ya ha dina nʼọnwụ, e lie ya na Tịaza. Ela, nwa ya nwoke, nọchiri ọnọdụ ya dịka eze.

1 Kings 16:6 in English

1 Kings 16:6 · Berean Standard Bible

And Baasha rested with his fathers and was buried in Tirzah, and his son Elah reigned in his place.

Context

4*Onye ọbụla nke metụtara Baasha nke nwụrụ nʼime obodo ka nkịta ga-eri ozu ya, ma ndị nwụrụ nʼọhịa ka anụ ufe nke eluigwe ga-eri ozu ha.” 5Akụkọ niile banyere ọrụ Baasha rụrụ, na ibu agha ya niile, e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ọrụ ndị eze Izrel? 6Baasha sooro ndị nna nna ya ha dina nʼọnwụ, e lie ya na Tịaza. Ela, nwa ya nwoke, nọchiri ọnọdụ ya dịka eze. 7Ma ozi Onyenwe anyị si nʼọnụ Jehu onye amụma, nwa Hanani bịara Baasha na ndị ezinaụlọ ya nʼihi ihe ọjọọ niile o mere, si otu a kpasuo Onyenwe anyị iwe. Ọ bụ ezie na ọ maara na Onyenwe anyị kpochapụrụ ezinaụlọ Jeroboam nʼihi ihe ọjọọ o mere, ma Baasha gara nʼihu mee ihe ọjọọ. 8Ela, nwa Baasha, malitere ịbụ eze Izrel nʼiri afọ abụọ na isii nke ịbụ eze Asa, eze Juda. Ma naanị afọ abụọ ka ọ chịrị dịka eze na Tịaza.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.