1 Ndị Eze 16:3
1 Kings 16:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ya mere, aga m ekpochapụ Baasha na ezinaụlọ ya, m ga-emekwa ụlọ gị ka ọ dịka ụlọ Jeroboam, nwa Nebat.
1 Kings 16:3 in English
1 Kings 16:3 · Berean Standard Bible
So now I will consume Baasha and his house, and I will make your house like that of Jeroboam son of Nebat:
Context
1Mgbe ahụ, ozi Onyenwe anyị sitere nʼọnụ Jehu, nwa Hanani banyere Baasha, eze Izrel sị ya, 2“Esi m nʼaja welie gị elu, mee gị onye ọchịchị ndị m Izrel. Ma i jeela ije nʼụzọ ọjọọ niile nke Jeroboam. I meela ka ndị m bụ Izrel mmehie, si otu a kpasuo m iwe site na mmehie ha. 3Ya mere, aga m ekpochapụ Baasha na ezinaụlọ ya, m ga-emekwa ụlọ gị ka ọ dịka ụlọ Jeroboam, nwa Nebat. 4*Onye ọbụla nke metụtara Baasha nke nwụrụ nʼime obodo ka nkịta ga-eri ozu ya, ma ndị nwụrụ nʼọhịa ka anụ ufe nke eluigwe ga-eri ozu ha.” 5Akụkọ niile banyere ọrụ Baasha rụrụ, na ibu agha ya niile, e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ọrụ ndị eze Izrel?
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.