Native Bible

1 Kings 15:31 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ma banyere ihe ndị ọzọ niile mere nʼoge ọchịchị Nadab, o bụ na e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ihe mere nʼoge ndị eze Izrel?

1 Kings 15:31 in English

1 Kings 15:31 · Berean Standard Bible

As for the rest of the acts of Nadab, along with all his accomplishments, are they not written in the Book of the Chronicles of the Kings of Israel?

Context

29Ngwangwa, mgbe ọ malitere ọchịchị ya, o gburu ndị ezinaụlọ Jeroboam niile. O kweghị ka onye ọbụla na-eku ume fọdụ, kama ọ lara ha niile nʼiyi, dịka okwu Onyenwe anyị kwuru site nʼọnụ onyeozi ya, bụ Ahija onye Shilo. 30Ihe ndị a mere nʼihi mmehie niile Jeroboam mere, nke o mere ka Izrel mee, nakwa nʼihi na ọ kpasuru Onyenwe anyị, bụ Chineke Izrel iwe. 31Ma banyere ihe ndị ọzọ niile mere nʼoge ọchịchị Nadab, o bụ na e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ihe mere nʼoge ndị eze Izrel? 32Ma agha dịgidere nʼetiti Asa na Baasha, eze Izrel, ụbọchị ọchịchị ha niile. 33Nʼafọ nke atọ nke Asa, eze Juda, Baasha nwa Ahija ghọrọ eze ndị Izrel niile na Tịaza. Ọ chịrị iri afọ abụọ na abụọ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.