Native Bible

1 Kings 15:17 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Baasha eze Izrel, busoro Juda agha, wuchie Rema igbochi onye ọbụla na-apụ apụ maọbụ onye na-abata abata nʼoke ala Asa, eze Juda.

1 Kings 15:17 in English

1 Kings 15:17 · Berean Standard Bible

Baasha king of Israel went to war against Judah and fortified Ramah to prevent anyone from leaving or entering the territory of Asa king of Judah.

Context

15O webatara nʼime ụlọnsọ Onyenwe anyị ọlaọcha na ọlaedo na ihe niile nke nna ya na ya onwe ya doro nsọ. 16Ma agha dịgidere nʼetiti Asa na Baasha, eze Izrel ụbọchị ọchịchị ha niile. 17Baasha eze Izrel, busoro Juda agha, wuchie Rema igbochi onye ọbụla na-apụ apụ maọbụ onye na-abata abata nʼoke ala Asa, eze Juda. 18Mgbe ahụ, Asa chịịrị ọlaọcha na ọlaedo niile dị nʼụlọakụ ụlọnsọ Onyenwe anyị, na ndị dị nʼụlọeze ya, nyefee ya nʼaka ndị ozi ya ka ha chịrị ha zigara Ben-Hadad, nwa Tabrimọm, nwa Hezion, bụ eze Aram, onye na-achị na Damaskọs, sị, 19“Biko, ka anyị gbaa ndụ dịka nna m na nna gị mere. Lee, ana m ezitere gị onyinye ọlaọcha na ọlaedo. Ugbu a, mebie ọgbụgba ndụ dị nʼetiti gị na Baasha, bụ eze Izrel, ka o si nʼebe m nọ wezuga onwe ya.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.