Native Bible

1 Kings 15:1 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Abija malitere ịbụ eze Juda, nʼafọ iri na asatọ nke ọchịchị eze Jeroboam nwa Nebat.

1 Kings 15:1 in English

1 Kings 15:1 · Berean Standard Bible

In the eighteenth year of the reign of Jeroboam son of Nebat, Abijam * became king of Judah,

Context

1Abija malitere ịbụ eze Juda, nʼafọ iri na asatọ nke ọchịchị eze Jeroboam nwa Nebat. 2Ọ chịrị afọ atọ na Jerusalem. Aha nne ya bụ Maaka, nwa nwanyị Abishalom. 3O mere mmehie niile nna ya mere nʼihu ya; o jighị obi zuruoke gbasoo Onyenwe anyị Chineke ya, dịka obi nna nna ya Devid dị.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.