Native Bible

1 Kings 14:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ma Onyenwe anyị agwalarị Ahija okwu sị ya, “Nwunye Jeroboam na-abịa ịjụta ase nʼaka gị banyere nwa ya nwoke ahụ na-adịghị ike, ọsịsa dị otu a ka i ganye ya. Mgbe ọ ga-abịa ịhụ gị ọ ga-eme onwe ya dịka ọ bụghị nwunye Jeroboam.”

1 Kings 14:5 in English

1 Kings 14:5 · Berean Standard Bible

But the LORD had said to Ahijah, “Behold, the wife of Jeroboam is coming to ask you about her son, for he is ill. You are to say such and such to her, because when she arrives, she will be disguised.”

Context

3Chịrịkwa ogbe achịcha iri, na achịcha nta ole na ole, na otu karama mmanụ aṅụ, jekwuru ya. Ọ ga-agwa gị ihe ga-eme banyere nwantakịrị a.” 4Nwunye Jeroboam mere ihe o kwuru, o biliri jee nʼụlọ Ahija na Shaịlo. Ahija bụ agadi nwoke nʼoge a. Ọ naghị ahụkwa ụzọ nʼihi nka ọ kara. 5Ma Onyenwe anyị agwalarị Ahija okwu sị ya, “Nwunye Jeroboam na-abịa ịjụta ase nʼaka gị banyere nwa ya nwoke ahụ na-adịghị ike, ọsịsa dị otu a ka i ganye ya. Mgbe ọ ga-abịa ịhụ gị ọ ga-eme onwe ya dịka ọ bụghị nwunye Jeroboam.” 6Mgbe Ahija nụrụ ụda nzọ ụkwụ ya ka ọ na-abata nʼọnụ ụzọ, ọ kpọrọ ya oku sị ya, “Bata, nwunye Jeroboam. Gịnị mere i ji jie ejiji dịka onye ọzọ? Enwere m akụkọ ọjọọ m ga-akọrọ gị 7Ga gwa Jeroboam sị ya, Otu a ka Onyenwe anyị, Chineke Izrel kwuru, ‘Esi m nʼetiti ndị m welie gị elu, mee gị ka ị bụrụ onye ga-achị ndị m, bụ Izrel.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.