Native Bible

1 Kings 14:21 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼoge a, Rehoboam nwa Solomọn, bụ eze Juda. Ọ gbara iri afọ anọ na otu mgbe ọ malitere ịbụ eze. Ọ chịrị afọ iri na asaa na Jerusalem, bụ obodo ahụ Onyenwe anyị họọrọ site nʼetiti ebo niile nke Izrel, bụ ebe ọ ga-akpọkwasị Aha ya. Aha nne ya bụ Naama, onye Amọn.

1 Kings 14:21 in English

1 Kings 14:21 · Berean Standard Bible

Meanwhile, Rehoboam son of Solomon reigned in Judah. He was forty-one years old when he became king, and he reigned seventeen years in Jerusalem, the city the LORD had chosen from all the tribes of Israel in which to put His Name. His mother’s name was Naamah the Ammonite.

Context

19Ihe niile ọzọ Jeroboam mere, na ihe niile banyere ibu agha ya niile, na ọtụtụ ihe ọzọ dị iche iche banyere ọchịchị ya, ka e dere nʼakwụkwọ akụkọ ihe ndị eze Izrel mere. 20Jeroboam chịrị Izrel iri afọ abụọ na abụọ. O sooro ndị nna nna ya ha dina nʼọnwụ, nwa ya Nadab ghọrọ eze nʼọnọdụ ya. 21Nʼoge a, Rehoboam nwa Solomọn, bụ eze Juda. Ọ gbara iri afọ anọ na otu mgbe ọ malitere ịbụ eze. Ọ chịrị afọ iri na asaa na Jerusalem, bụ obodo ahụ Onyenwe anyị họọrọ site nʼetiti ebo niile nke Izrel, bụ ebe ọ ga-akpọkwasị Aha ya. Aha nne ya bụ Naama, onye Amọn. 22Mgbe ahụ, ndị Juda mehiekwara megide Onyenwe anyị. Ha sitere nʼọtụtụ mmehie ha mere, nke karịrị mmehie nke ndị nna nna ha ochie mere, kpasuo ekworo ya. 23Ha wukwara nye onwe ha ebe ịchụ aja na ogidi arụsị nʼelu ugwu niile, na ogidi chi Ashera, na nʼokpuru osisi ọbụla akwụkwọ ndụ dị nʼelu ya.*

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.