1 Ndị Eze 13:4
1 Kings 13:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe eze Jeroboam nụrụ ihe onye nke Chineke ahụ kwuru megide ebe ịchụ aja Betel, o setịpụrụ aka ya site nʼebe ịchụ aja ahụ sị, “Jidenụ nwoke a!” Ma aka ahụ ọ setịpụrụ tụgide nwoke ahụ kpọnwụrụ na o nwekwaghị ike iweghachi ya azụ ọzọ.
1 Kings 13:4 in English
1 Kings 13:4 · Berean Standard Bible
Now when King Jeroboam, who was at the altar in Bethel, heard the word that the man of God had cried out against it, he stretched out his hand and said, “Seize him!” But the hand he stretched out toward him withered, so that he could not pull it back.
Context
2O tiri mkpu nʼoke olu megide ebe ịchụ aja ahụ dịka okwu Onyenwe anyị si dị, “Ebe ịchụ aja, ebe ịchụ aja! Otu a ka Onyenwe anyị na-ekwu: ‘A ga-amụ otu nwa nwoke nʼụlọ Devid, aha ya ga-abụ Josaya.* Ọ ga-eji ndị nchụaja niile nke ebe dị elu, bụ ndị na-achụ aja nʼelu gị, chụọ aja nʼelu gị. A ga-esurekwa ọkpụkpụ ndị mmadụ ọkụ nʼelu gị.’ ” 3Nʼụbọchị ahụ, onye nke Chineke ahụ kwuru okwu banyere ihe ịrịbama ga-emezu. O kwuru sị, “Nke a bụ ihe ịrịbama Onyenwe anyị ji emesi okwu ya ike: Ebe ịchụ aja a ga-agbawa ụzọ abụọ. Ntụ dị nʼelu ya ga-awụsasị nʼala.” 4Mgbe eze Jeroboam nụrụ ihe onye nke Chineke ahụ kwuru megide ebe ịchụ aja Betel, o setịpụrụ aka ya site nʼebe ịchụ aja ahụ sị, “Jidenụ nwoke a!” Ma aka ahụ ọ setịpụrụ tụgide nwoke ahụ kpọnwụrụ na o nwekwaghị ike iweghachi ya azụ ọzọ. 5Ọzọkwa, ebe ịchụ aja ahụ gbawara abụọ, ntụ dị nʼelu ya wụsịkwara nʼala dịka ihe ịrịbama nke onye amụma Chineke nyere, site nʼokwu Onyenwe anyị. 6Mgbe ahụ, eze sịrị onye nke Chineke ahụ, “Biko, rịọọ Onyenwe anyị Chineke gị, kpekwara m ekpere ka e nyeghachi m aka m.” Ya mere, onye nke Chineke ahụ rịọrọ Onyenwe anyị site nʼekpere, emekwara ka aka eze dịghachi dịkwa ka ọ dị na mbụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.