Native Bible

1 Kings 13:19 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ya mere, nwoke nke Chineke ahụ soro ya laghachi rie nri, ṅụọkwa mmiri.

1 Kings 13:19 in English

1 Kings 13:19 · Berean Standard Bible

but the man of God went back with him, ate bread in his house, and drank water.

Context

17Nʼihi na a gwara m site nʼokwu Onyenwe anyị sị, ‘Erikwala nri maọbụ ṅụọ mmiri nʼebe ahụ, maọbụ soro ụzọ ị si gaa lọtakwa.’ ” 18Ma onye nke ọzọ sịrị ya, “Mụ onwe m bụkwa onye amụma dịka gị, mmụọ ozi zikwara m ozi site nʼokwu Onyenwe anyị sị, ‘Kpọrọ ya ka o soro gị laghachi nʼụlọ gị, ka o rie nri, ṅụọkwa mmiri.’ ” (Ma ọ gwara ya okwu ụgha.) 19Ya mere, nwoke nke Chineke ahụ soro ya laghachi rie nri, ṅụọkwa mmiri. 20Ma mgbe ha abụọ nọdụ na-eri ihe na tebul, okwu Onyenwe anyị rutere onye amụma agadi ahụ ntị, bụ onye mere ka ọ lọghachi azụ. 21Ọ kpọrọ onye nke Chineke ahụ si Juda bịa sị ya, “Otu a ka Onyenwe anyị na-ekwu, ‘Nʼihi na ị nupula isi nʼokwu ọnụ Onyenwe anyị, hapụ idebe iwu Onyenwe anyị Chineke gị nyere gị.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.