Native Bible

1 Kings 13:1 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Otu onye nke Chineke si Juda bịa Betel, site nʼokwu nke Onyenwe anyị oge Jeroboam guzo nʼebe ịchụ aja ka ọ chụọ aja.

1 Kings 13:1 in English

1 Kings 13:1 · Berean Standard Bible

Suddenly, as Jeroboam was standing beside the altar to burn incense, there came a man of God from Judah to Bethel by the word of the LORD.

Context

1Otu onye nke Chineke si Juda bịa Betel, site nʼokwu nke Onyenwe anyị oge Jeroboam guzo nʼebe ịchụ aja ka ọ chụọ aja. 2O tiri mkpu nʼoke olu megide ebe ịchụ aja ahụ dịka okwu Onyenwe anyị si dị, “Ebe ịchụ aja, ebe ịchụ aja! Otu a ka Onyenwe anyị na-ekwu: ‘A ga-amụ otu nwa nwoke nʼụlọ Devid, aha ya ga-abụ Josaya.* Ọ ga-eji ndị nchụaja niile nke ebe dị elu, bụ ndị na-achụ aja nʼelu gị, chụọ aja nʼelu gị. A ga-esurekwa ọkpụkpụ ndị mmadụ ọkụ nʼelu gị.’ ” 3Nʼụbọchị ahụ, onye nke Chineke ahụ kwuru okwu banyere ihe ịrịbama ga-emezu. O kwuru sị, “Nke a bụ ihe ịrịbama Onyenwe anyị ji emesi okwu ya ike: Ebe ịchụ aja a ga-agbawa ụzọ abụọ. Ntụ dị nʼelu ya ga-awụsasị nʼala.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.