1 Ndị Eze 12:6
1 Kings 12:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe ahụ, eze Rehoboam gara ịnata ndụmọdụ nʼaka ndị okenye, bụ ndị jeere nna ya Solomọn ozi nʼoge ọ dị ndụ, sị ha, “Olee ndụmọdụ unu ga-enye m maka mụ inye ndị a ọsịsa?”
1 Kings 12:6 in English
1 Kings 12:6 · Berean Standard Bible
Then King Rehoboam consulted with the elders who had served his father Solomon during his lifetime. “How do you advise me to respond to these people?” he asked.
Context
4“Nna gị boro anyị ibu arọ, ma ugbu a mee ka ibu arọ na ịyagba arọ a nke o bokwasịrị anyị, dị mfe, anyị ga-ejere gị ozi.” 5Rehoboam zara ha sị, “Laanụ, ụbọchị atọ gasịa unu bịaghachikwutenụ m.” Nʼihi ya ndị ahụ lara. 6Mgbe ahụ, eze Rehoboam gara ịnata ndụmọdụ nʼaka ndị okenye, bụ ndị jeere nna ya Solomọn ozi nʼoge ọ dị ndụ, sị ha, “Olee ndụmọdụ unu ga-enye m maka mụ inye ndị a ọsịsa?” 7Ha zara ya, “Ọ bụrụ na ị ga-abụ odibo nye ndị a taa, jeere ha ozi, nyekwa ha ọsịsa dị mma,* ha ga-anọgide bụrụ ndị ohu gị mgbe niile.” 8Ma ọ nabataghị ndụmọdụ ndị okenye nyere ya, ọ gakwuru ụmụ okorobịa ndị ya na ha tokọrọ, bụkwa ndị na-ejere ya ozi, ka ha nye ya ndụmọdụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.