1 Ndị Eze 12:17
1 Kings 12:17 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma banyere ndị Izrel bi nʼobodo niile nke Juda, Rehoboam gara nʼihu bụrụ eze ha.
1 Kings 12:17 in English
1 Kings 12:17 · Berean Standard Bible
but Rehoboam still reigned over the Israelites living in the cities of Judah.
Context
15Ya mere, eze aṅaghị ndị ahụ ntị, nʼihi mgbanwe nke ọnọdụ niile a sitere nʼebe Onyenwe anyị nọ, ka e mezuo okwu ahụ Onyenwe anyị gwara Jeroboam nwa Nebat site nʼọnụ Ahija onye Shilo. 16Mgbe Izrel niile hụrụ na eze jụrụ ige ha ntị, ha zaghachiri ya sị,
“Olee oke anyị nwere nʼime Devid?
Olee ihe nketa anyị nwere nʼime nwa Jesi?
Ndị Izrel, laanụ nʼụlọ ikwu unu!
Gị Devid lekọtakwa ụlọ nke gị.”
Ya mere, ndị Izrel lara nʼụlọ ha. 17Ma banyere ndị Izrel bi nʼobodo niile nke Juda, Rehoboam gara nʼihu bụrụ eze ha. 18Eze Rehoboam zipụrụ Adoniram, onyeisi na-elekọta ndị ọrụ mmanye, ma ndị Izrel niile ji nkume tugbuo ya. Ma eze Rehoboam jisiri ike gbaba nʼime ụgbọ agha ya, gbalaga laa Jerusalem. 19Ya mere, Izrel nọ na nnupu isi megide ụlọ Devid ruo taa.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.