1 Ndị Eze 12:13
1 Kings 12:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Eze sara ndị a okwu nʼolu dị ike. Ọ jụrụ ndụmọdụ nke ndị okenye nyere ya,
1 Kings 12:13 in English
1 Kings 12:13 · Berean Standard Bible
And the king answered the people harshly. He rejected the advice of the elders
Context
11Nna m boro unu ibu arọ; aga m atụkwasị ihe nʼibu ahụ mee ka ọ dị arọ karịa. Nna m ji apịpịa dọọ unu aka na ntị, maọbụ akpị ka m ga-eji mekpaa unu ahụ.’ ” 12Mgbe ụbọchị atọ gasịrị, Jeroboam na ndị Izrel* niile bịaghachiri ịnụrụ ọsịsa Rehoboam, dịka eze kwuru, sị, “Laghachitenụ nʼụbọchị nke atọ.” 13Eze sara ndị a okwu nʼolu dị ike. Ọ jụrụ ndụmọdụ nke ndị okenye nyere ya, 14ma gbasoro ndụmọdụ nke ụmụ okorobịa nyere. Ọ sịrị, “Nna m mere ka ibu unu dị arọ, aga m eme ka ibu unu dị arọ karịa. Nna m ji apịpịa dọọ unu aka na ntị, aga m eji akpị mekpaa unu ahụ.” 15Ya mere, eze aṅaghị ndị ahụ ntị, nʼihi mgbanwe nke ọnọdụ niile a sitere nʼebe Onyenwe anyị nọ, ka e mezuo okwu ahụ Onyenwe anyị gwara Jeroboam nwa Nebat site nʼọnụ Ahija onye Shilo.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.