1 Ndị Eze 12:10
1 Kings 12:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ụmụ okorobịa ahụ, bụ ndị ya na ha tokọrọ, zaghachiri sị, “Gwa ndị ahụ sịrị gị, ‘Nna gị bokwasịrị anyị ibu arọ, ma mee ka ibu anyị dị mfe,’ ị ga-agwa ha, sị, ‘Mkpịsịaka nta dị nʼaka m gbara okpotokpo karịa ukwu nna m.
1 Kings 12:10 in English
1 Kings 12:10 · Berean Standard Bible
The young men who had grown up with him replied, “This is how you should answer these people who said to you, ‘Your father made our yoke heavy, but you should make it lighter.’ This is what you should tell them: ‘My little finger is thicker than my father’s waist!
Context
8Ma ọ nabataghị ndụmọdụ ndị okenye nyere ya, ọ gakwuru ụmụ okorobịa ndị ya na ha tokọrọ, bụkwa ndị na-ejere ya ozi, ka ha nye ya ndụmọdụ. 9Rehoboam jụrụ ha sị, “Gịnị bụ ndụmọdụ unu? Gịnị bụ ọsịsa anyị ga-enye ndị a na-asị, ‘Mee ka ibu arọ nna gị bokwasịrị anyị dị mfe’? ” 10Ụmụ okorobịa ahụ, bụ ndị ya na ha tokọrọ, zaghachiri sị, “Gwa ndị ahụ sịrị gị, ‘Nna gị bokwasịrị anyị ibu arọ, ma mee ka ibu anyị dị mfe,’ ị ga-agwa ha, sị, ‘Mkpịsịaka nta dị nʼaka m gbara okpotokpo karịa ukwu nna m. 11Nna m boro unu ibu arọ; aga m atụkwasị ihe nʼibu ahụ mee ka ọ dị arọ karịa. Nna m ji apịpịa dọọ unu aka na ntị, maọbụ akpị ka m ga-eji mekpaa unu ahụ.’ ” 12Mgbe ụbọchị atọ gasịrị, Jeroboam na ndị Izrel* niile bịaghachiri ịnụrụ ọsịsa Rehoboam, dịka eze kwuru, sị, “Laghachitenụ nʼụbọchị nke atọ.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.