Native Bible

1 Kings 11:41 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ma banyere ihe ndị ọzọ mere nʼoge ọchịchị Solomọn, nke bụ, ihe niile o mere na amamihe o gosipụtara, ọ bụ na-edeghị ha nʼakwụkwọ akụkọ nke Solomọn?

1 Kings 11:41 in English

1 Kings 11:41 · Berean Standard Bible

As for the rest of the acts of Solomon—all that he did, as well as his wisdom—are they not written in the Book of the Acts of Solomon?

Context

39Aga m eweda agbụrụ Devid nʼihi ihe a, ma ha agaghị abụ ndị e wedara nʼala ruo ebighị ebi.’ ” 40Solomọn gbalịrị igbu Jeroboam, ma Jeroboam gbaara ọsọ gbakwuru eze Shishak nke Ijipt.* Ọ nọkwara nʼIjipt ruo mgbe Solomọn nwụrụ. 41Ma banyere ihe ndị ọzọ mere nʼoge ọchịchị Solomọn, nke bụ, ihe niile o mere na amamihe o gosipụtara, ọ bụ na-edeghị ha nʼakwụkwọ akụkọ nke Solomọn? 42Solomọn chịrị Izrel niile iri afọ anọ na Jerusalem. 43O sooro nna nna ya ha dina nʼọnwụ, e lie ya nʼobodo Devid bụ nna ya. Rehoboam nwa ya, ghọkwara eze nʼọnọdụ nna ya. 11:5 Maọbụ, Milkọm 11:7 Ugwu dị nʼọwụwa anyanwụ Jerusalem Ugwu a, bụ Ugwu Oliv, nke aha ọzọ a na-akpọ ya bụ Ugwu rụrụ arụ, 2Ez 23:13 11:40 Eze Shishak, bụ Fero mbụ chịrị Ijipt na senchuri nke iri. Mgbe ọchịchị pụrụ site nʼaka ezinaụlọ a, ahọpụtara onye ọzọ ga-achị 1Ez 14:25-26; 2Ih 12:2-9

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.