Native Bible

1 Kings 10:15 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

na-agụnyeghị uru nke na-esi nʼaka ndị na-atụ mgbereahịa na ndị na-azụ ahịa na nke sitekwara nʼaka ndị eze Arebịa niile, nakwa nʼaka ndịisi na-achị obodo niile nke ala ahụ.

1 Kings 10:15 in English

1 Kings 10:15 · Berean Standard Bible

not including the revenue from the merchants, traders, and all the Arabian kings and governors of the land.

Context

13Eze Solomọn nyekwara eze nwanyị Sheba ihe niile ọ chọrọ na ihe niile bụ nke ọ rịọrọ, na-agụnyeghị onyinye niile Solomọn nyere ya dịka eze ọ bụ. Emesịa, ọ hapụrụ laghachi nʼala nke aka ya, ya na ndị na-ejere ya ozi. 14Ọtụtụ ịdị arọ nke ọlaedo Solomọn na-enweta kwa afọ bụ puku kilogram iri abụọ na atọ,* 15na-agụnyeghị uru nke na-esi nʼaka ndị na-atụ mgbereahịa na ndị na-azụ ahịa na nke sitekwara nʼaka ndị eze Arebịa niile, nakwa nʼaka ndịisi na-achị obodo niile nke ala ahụ. 16Eze Solomọn kpụrụ narị ọta ọlaedo ukwu abụọ site nʼọlaedo etipịara etipịa. Ọ bụ ọlaedo nke ịdị arọ ya ruru kilogram isii na ụma itoolu ka eji kpụọ ọta ọbụla. 17Ọ kpụkwara narị ọta nta atọ, nke sitere na ọlaedo etipịara etipịa. Ọ bụ ọlaedo ịdị arọ ya ruru kilogram atọ na ọkara ka eji kpụọ ọta ọbụla. Eze debere ha nʼụlọeze nʼOke Ọhịa Lebanọn.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.