1 Ndị Eze 10:12
1 Kings 10:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Eze ji osisi almụg ndị a wuo ogidi ndabere dị nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị na nke ụlọeze. O jikwa ya meere ndị na-abụ abụ ụbọ akwara na une. Ọ dịbeghị mgbe ọbụla ahụrụ maọbụ tụbata osisi almụg ha otu a site nʼụbọchị ahụ ruo taa.)
1 Kings 10:12 in English
1 Kings 10:12 · Berean Standard Bible
The king made the almug wood into steps for the house of the LORD and for the king’s palace, and into lyres and harps for the singers. Never before had such almug wood been brought in, nor has such been seen to this day.)
Context
10O nyere Solomọn onyinye ọlaedo ịdị arọ ya dị puku kilogram anọ,* nyekwa ya ọtụtụ ụda na-esi isi ụtọ dị iche iche, na ọtụtụ nkume dị oke ọnụahịa. O nwebeghị oge ọzọ ewebatara ọtụtụ ụda na-esi isi ụtọ dịka ndị ahụ eze nwanyị Sheba nyere eze Solomọn. 11(Ọzọkwa, ọtụtụ ụgbọ mmiri nke eze Hiram bubatara ọlaedo site nʼỌfịa bulatara Solomọn. Ha sitekwara nʼebe ahụ bute osisi almụg nʼebe ọ bara ụba, na ọtụtụ nkume dị oke ọnụahịa dị iche iche. 12Eze ji osisi almụg ndị a wuo ogidi ndabere dị nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị na nke ụlọeze. O jikwa ya meere ndị na-abụ abụ ụbọ akwara na une. Ọ dịbeghị mgbe ọbụla ahụrụ maọbụ tụbata osisi almụg ha otu a site nʼụbọchị ahụ ruo taa.) 13Eze Solomọn nyekwara eze nwanyị Sheba ihe niile ọ chọrọ na ihe niile bụ nke ọ rịọrọ, na-agụnyeghị onyinye niile Solomọn nyere ya dịka eze ọ bụ. Emesịa, ọ hapụrụ laghachi nʼala nke aka ya, ya na ndị na-ejere ya ozi. 14Ọtụtụ ịdị arọ nke ọlaedo Solomọn na-enweta kwa afọ bụ puku kilogram iri abụọ na atọ,*
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.