1 Ndị Eze 10:1
1 Kings 10:1 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe eze nwanyị Sheba nụrụ akụkọ Solomọn, na ịdị na mma nke dị nʼetiti ya na Onyenwe anyị, ọ bịara ka o were ọtụtụ ajụjụ siri ike nwalee Solomọn.*
1 Kings 10:1 in English
1 Kings 10:1 · Berean Standard Bible
Now when the queen of Sheba heard about the fame of Solomon concerning the name of the LORD, she came to test him with difficult questions.
Context
1Mgbe eze nwanyị Sheba nụrụ akụkọ Solomọn, na ịdị na mma nke dị nʼetiti ya na Onyenwe anyị, ọ bịara ka o were ọtụtụ ajụjụ siri ike nwalee Solomọn.* 2Ọ bịarutere Jerusalem, ya na ọtụtụ ndị ozi nʼebe ha bara ụba, ndị so ya, tinyere ọtụtụ ịnyịnya kamel ndị bu ụda dị iche iche, ọtụtụ ọlaedo na nkume dị oke ọnụahịa dị iche iche. Ọ bịakwutere Solomọn, ya na ya kparịtara ụka banyere ihe niile nke dị ya nʼobi. 3Solomọn zara ya ajụjụ ya niile; ọ dịkwaghị ihe siiri eze ike ịkọwara ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.