Native Bible

1 Kings 1:30 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

otu ahụ m siri ṅụrụ gị iyi nʼaha Onyenwe anyị, Chineke Izrel, sị, na Solomọn nwa gị ga-abụ eze nʼọnọdụ m, ọ bụ ya ga-anọchi anya m, nọdụkwa nʼocheeze m. Otu ahụ ka m ga-eme nʼụbọchị taa.”

1 Kings 1:30 in English

1 Kings 1:30 · Berean Standard Bible

I will carry out this very day exactly what I swore to you by the LORD, the God of Israel: Surely your son Solomon will reign after me, and he will sit on my throne in my place.”

Context

28Mgbe ahụ, Devid kwuru okwu sị, “Kpọọrọnụ m Batsheba.” Batsheba batara, guzo nʼihu eze. 29Mgbe ahụ, eze ṅụrụ iyi sị ya, “Dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ, Onye ahụ napụtara m site na nsogbu m niile, 30otu ahụ m siri ṅụrụ gị iyi nʼaha Onyenwe anyị, Chineke Izrel, sị, na Solomọn nwa gị ga-abụ eze nʼọnọdụ m, ọ bụ ya ga-anọchi anya m, nọdụkwa nʼocheeze m. Otu ahụ ka m ga-eme nʼụbọchị taa.” 31Mgbe ahụ, Batsheba kpọrọ isiala, gbukwaa ikpere nʼihu eze sị ya, “Ka onyenwe m eze Devid dịrị ndụ ruo mgbe ebighị ebi.” 32Mgbe ahụ, Devid nyere iwu sị, “Kpọọrọ m Zadọk onye nchụaja, na Netan onye amụma, na Benaya, nwa Jehoiada.” Mgbe ha niile bịara nʼihu eze,

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.