Native Bible

1 Kings 1:25 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Taa, ọ gaala jiri ọtụtụ igwe ehi, na ụmụ ehi gbara abụba, na ụmụ atụrụ chụọ aja. Ọ kpọọkwala ụmụ ndị ikom eze niile. Ọ kpọkwara ndịisi agha, na Abịata onye nchụaja. Ha na ya na-eri ihe oriri, na-aṅụkwa ihe ọṅụṅụ, na-eti mkpu na-asị, ‘Eze Adonaịja ga-adị ruo mgbe ebighị ebi.’

1 Kings 1:25 in English

1 Kings 1:25 · Berean Standard Bible

For today he has gone down and sacrificed an abundance of oxen, fattened calves, and sheep, and has invited all the sons of the king, the commanders * of the army, and Abiathar the priest. And behold, they are eating and drinking before him, saying, ‘Long live King Adonijah!’

Context

23A gwara eze okwu sị, “Netan onye amụma nọ nʼebe a.” Ya mere, ọ gara nʼihu eze kpọọ isiala nye ya. 24Netan sịrị, “Onyenwe m, bụ eze, ọ bụ gị onwe gị sịrị Adonaịja ga-abụ eze mgbe ị nwụrụ, na ọ ga-anọkwasịkwa nʼocheeze gị? 25Taa, ọ gaala jiri ọtụtụ igwe ehi, na ụmụ ehi gbara abụba, na ụmụ atụrụ chụọ aja. Ọ kpọọkwala ụmụ ndị ikom eze niile. Ọ kpọkwara ndịisi agha, na Abịata onye nchụaja. Ha na ya na-eri ihe oriri, na-aṅụkwa ihe ọṅụṅụ, na-eti mkpu na-asị, ‘Eze Adonaịja ga-adị ruo mgbe ebighị ebi.’ 26Ma ha akpọghị mụ bụ ohu gị na Zadọk, onye nchụaja, na Benaya nwa Jehoiada, na ohu gị bụ Solomọn. 27Ọ bụ site nʼaka onyenwe m bụ eze ka ihe nke a siri mee, ma i meghị ka ndị ohu ya mata onye ga-anọdụ nʼocheeze onyenwe m eze, mgbe ọ nọghịkwa ya?”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.