Native Bible

1 Kings 1:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe ahụ, Netan onye amụma jụrụ Batsheba nne Solomọn ajụjụ sị, “Ị nụghị na Adonaịja nwa Hagit aghọọla eze ugbu a, ma onyenwe anyị bụ Devid amaghị ihe ọbụla banyere ya?

1 Kings 1:11 in English

1 Kings 1:11 · Berean Standard Bible

Then Nathan said to Bathsheba the mother of Solomon, “Have you not heard that Adonijah son of Haggith has become king, and our lord David does not know it?

Context

9Adonaịja chịịrị atụrụ, ehi na ụmụ ehi gbara abụba, gaa nʼakụkụ En-Rogel chụọ aja na Nkume Zohelet. Ọ kpọrọ ụmụnne ya niile bụ ụmụ ndị ikom eze na ndịisi Juda niile, ndị na-ejere eze ozi oku, 10ma ọ kpọghị Netan onye amụma, maọbụ Benaya, maọbụ ndị agha niile na-eche Devid nche. Ọ kpọkwaghị Solomọn nwanne ya. 11Mgbe ahụ, Netan onye amụma jụrụ Batsheba nne Solomọn ajụjụ sị, “Ị nụghị na Adonaịja nwa Hagit aghọọla eze ugbu a, ma onyenwe anyị bụ Devid amaghị ihe ọbụla banyere ya? 12Ma ugbu a, ka m dụọ gị ọdụ otu ị ga-esi zọpụta ndụ gị na ndụ nwa gị Solomọn. 13Bakwuru eze Devid sị ya, ‘Onyenwe m bụ eze, ọ bụ na i kweghị m bụ ohu gị nkwa sị: “Nʼezie, Solomọn nwa gị ga-abụ eze nʼọnọdụ m, ọ ga-anọdụ nʼocheeze m”? Ma gịnị mere Adonaịja ji bụrụ eze?’

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.