1 Jọn 5:19
1 John 5:19 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Anyị maara na anyị bụ ụmụ Chineke, ụwa niile nọkwa nʼokpuru ike ajọ onye ahụ.
1 John 5:19 in English
1 John 5:19 · Berean Standard Bible
We know that we are of God, and that the whole world is under the power of the evil one.
Context
17Ajọ omume niile bụ mmehie, ma ọ dị mmehie nke na-adịghị eduba nʼọnwụ. 18Anyị matara na onye ọbụla amụrụ site na Chineke anaghị aga nʼihu na-eme mmehie, kama onye ahụ nke amụrụ site na Chineke na-echekwa ha, ajọ onye ahụ adịghị emetụkwa ha aka. 19Anyị maara na anyị bụ ụmụ Chineke, ụwa niile nọkwa nʼokpuru ike ajọ onye ahụ. 20Anyị matakwara na Ọkpara Chineke abịala, nyekwa anyị nghọta ka anyị mara ya, onye bụ eziokwu. Anyị nọ nʼime onye ahụ bụ eziokwu, ọ bụladị nʼime Ọkpara ya, bụ Jisọs Kraịst. Ya onwe ya bụ ezi Chineke bụrụkwa ndụ ebighị ebi. 21Ụmụ m, wezuganụ onwe unu site nʼarụsị niile.
5:8 Nʼakwụkwọ ndị ọhụrụ nke Vụlget na-agba akaebe nʼeluigwe: Nna, Okwu ahụ na Mmụọ Nsọ, ha atọ bụ otu. 8 Ha dịkwa atọ na-agba akaebe nʼụwa: (nke a adịghị nʼakwụkwọ Griik ọbụla tupu senchuri nke iri na anọ)
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.