1 Jọn 3:13
1 John 3:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ka ọ gharakwa iju unu anya ụmụnna m, na ụwa kpọrọ unu asị.
1 John 3:13 in English
1 John 3:13 · Berean Standard Bible
So do not be surprised, brothers, if the world hates you.
Context
11Nʼihi na nke a bụ ozi ahụ unu nụrụ site na mmalite, ka anyị hụrịta onwe anyị nʼanya. 12Ka anyị hapụ ịdị ka Ken, onye bụ nke ajọ onye ahụ, na onye gburu nwanne ya. Gịnị mere o ji gbuo ya? Ọ bụ nʼihi na ọrụ ya jọrọ njọ, ma nke nwanne ya ziri ezi. 13Ka ọ gharakwa iju unu anya ụmụnna m, na ụwa kpọrọ unu asị. 14Anyị matara na anyị esitela nʼọnwụ baa na ndụ nʼihi na anyị na-ahụ ụmụnna* anyị nʼanya. Onye ọbụla na-adịghị ahụ ibe ya nʼanya na-anọgide nʼọnwụ. 15Onye ọbụla na-akpọ nwanna ya asị bụ ogbu mmadụ, unu matakwara na o nweghị onye ọbụla bụ ogbu mmadụ nwere ndụ ebighị ebi nʼime ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.