Native Bible

1 John 2:22 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Onye bụ onye okwu ụgha? Ọ bụ onye ahụ na-asị na Jisọs abụghị Kraịst ahụ. Onye dị otu a bụ onye na-emegide Kraịst, nʼihi na ọ nabataghị Nna ahụ na Ọkpara ya.

1 John 2:22 in English

1 John 2:22 · Berean Standard Bible

Who is the liar, if it is not the one who denies that Jesus is the Christ? This is the antichrist, who denies the Father and the Son.

Context

20Ma unu nwere otite mmanụ sitere nʼOnye Nsọ ahụ, unu niile matakwara ihe niile. 21Ya mere, anaghị m edegara unu akwụkwọ a dịka ndị na-amaghị eziokwu kama nʼihi na unu maara ya na nʼihi na ọ dịghị okwu ụgha ọbụla na-esi nʼeziokwu ahụ apụta. 22Onye bụ onye okwu ụgha? Ọ bụ onye ahụ na-asị na Jisọs abụghị Kraịst ahụ. Onye dị otu a bụ onye na-emegide Kraịst, nʼihi na ọ nabataghị Nna ahụ na Ọkpara ya. 23Onye ọbụla jụrụ Ọkpara ahụ enwekwaghị Nna ahụ; ma onye ọbụla nabatara Ọkpara ahụ nwekwara Nna ahụ. 24Hụnụ na ihe unu nụrụ site na mmalite na-anọgide nʼime unu. Ọ bụrụ na ihe unu nụrụ na mbido ebiri nʼime unu, unu ga-anọgide nʼime Ọkpara ahụ na nʼime Nna ahụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.