Native Bible

1 Corinthians 9:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Anaghị m ekwu ihe a nʼihi na ha bụ ihe na-eme ụbọchị niile nʼetiti ndị mmadụ? Akwụkwọ iwu, o kwukwaghị otu ihe ahụ?

1 Corinthians 9:8 in English

1 Corinthians 9:8 · Berean Standard Bible

Do I say this from a human perspective? Doesn’t the Law say the same thing?

Context

6Ọ ga-abụ naanị mụ na Banabas bụ ndị na-enweghị ike ịhapụ ịrụ ọrụ maka ihe anyị ga na-eri? 7Olee onye agha unu maara nke na-esi nʼakpa ya akwụ onwe ya ụgwọ ọnwa? Ka ọ dị onye ọrụ ubi vaịnị unu maara nke na-adịghị eri mkpụrụ e si nʼubi ahụ weta? Olee onye ọzụzụ atụrụ unu maara nke na-adịghị aṅụ mmiri ara e si nʼigwe atụrụ ọ na-azụ apịpụta? 8Anaghị m ekwu ihe a nʼihi na ha bụ ihe na-eme ụbọchị niile nʼetiti ndị mmadụ? Akwụkwọ iwu, o kwukwaghị otu ihe ahụ? 9Nʼihi na e dere ya nʼiwu nke Mosis, “Ekechila ọnụ ehi mgbe ọ na-azọcha mkpụrụ ọka.”* Unu chere na ọ bụ naanị ehi ka Chineke bu nʼobi kwuo okwu a? 10E, nʼihi anyị ka eji dee ya nʼakwụkwọ. Nʼezie, e dere ihe ndị a nʼihi anyị, nʼihi na onye rụrụ ọrụ nʼubi na onye na-azọcha mkpụrụ dị nʼubi ahụ, na-eme nke a nʼolileanya na o kwesiri iketa oke site na mkpụrụ e si nʼubi ahụ weta.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.