Native Bible

1 Corinthians 9:17 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

A sị na m ji aka m họpụta onwe m ịrụ ọrụ a, agaara m enwe ụgwọ ọrụ, ma na ọ bụrụ na o sighị nʼuche aka m, unu mara na-ahanyere m ya nʼaka.

1 Corinthians 9:17 in English

1 Corinthians 9:17 · Berean Standard Bible

If my preaching is voluntary, I have a reward. But if it is not voluntary, I am still entrusted with a responsibility.

Context

15Ma o nweghị mgbe m jirila ike ndị a m nwere irite uru nʼọrụ m nara ndị mmadụ ihe. Anaghị m ede nke a nʼakwụkwọ ka a na-ebutere m ihe onyinye. Nʼihi na ọ kaara m mma ka m nwụọ kama m ga-ekwe ka onye ọbụla mee ka ịnya isi m bụrụ ihe efu nʼihi ihe onyinye. 16Anaghị anya isi nʼihi na ana m ezisa oziọma, maka na nke ahụ bụ ọrụ e nyere m nʼiwu ka m rụọ. Ahụhụ dịịrị m ma ọ bụrụ na m ezisaghị oziọma. 17A sị na m ji aka m họpụta onwe m ịrụ ọrụ a, agaara m enwe ụgwọ ọrụ, ma na ọ bụrụ na o sighị nʼuche aka m, unu mara na-ahanyere m ya nʼaka. 18Gịnị bụ ụgwọ ọrụ m? Ụgwọ ọrụ m bụ ọṅụ m na-enwe site nʼizisa oziọma a, na-anaghị onye ọbụla ụgwọ ọrụ ọbụla, maọbụ ihe ruru m dịka onye na-ezisa oziọma ahụ. 19Ọ bụ ezie na-abụghị m ohu onye ọbụla, ma emeela m onwe m ohu nye mmadụ niile ka m nwee ike site nʼụzọ dị otu a rite ọtụtụ mkpụrụobi nʼuru nye Kraịst.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.