Native Bible

1 Corinthians 7:36 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọ bụrụ na nwoke ọbụla enweghị ike ijide onwe ya nʼihi agụụ mmekọrịta nke nwoke na nwanyị na-agụ ya nʼebe nwaagbọghọ ya na ya kpebiri ịlụ nọ, ya mee ihe ọ na-achọ, o meghị mmehie ọbụla, ha lụọ di na nwunye.

1 Corinthians 7:36 in English

1 Corinthians 7:36 · Berean Standard Bible

However, if someone thinks he is acting inappropriately toward his betrothed, and if she is beyond her youth and they ought to marry,* let him do as he wishes; he is not sinning; they should get married.

Context

34Ọ na-enwekwa obi abụọ nʼihe ọbụla ọ chọrọ ime. Otu a ka ọ dịkwa nye nwaagbọghọ na-alụbeghị di maọbụ onye nke na-amabeghị nwoke, nchegbu ya bụ banyere ihe nke Onyenwe anyị. Ọchịchọ ya bụ ka ọ dị nsọ nʼanụ ahụ ya na nʼime mmụọ ya. Ma nwanyị nwere di na-echegbu onwe ya banyere ihe nke ụwa a, otu ọ ga-esi mee ihe ga-atọ di ya ụtọ. 35Ana m ekwu ihe ndị a maka ọ dị mma nke unu onwe unu, ọ bụghị ịgbalị igbochi unu, kama ọ bụ ka unu nwee ike bie ndụ unu nʼụzọ kwesiri ekwesi, werekwa ịhụnanya zuruoke rụọra Onyenwe anyị ọrụ. 36Ọ bụrụ na nwoke ọbụla enweghị ike ijide onwe ya nʼihi agụụ mmekọrịta nke nwoke na nwanyị na-agụ ya nʼebe nwaagbọghọ ya na ya kpebiri ịlụ nọ, ya mee ihe ọ na-achọ, o meghị mmehie ọbụla, ha lụọ di na nwunye. 37Ma ọ bụrụ na onye ọbụla ekpebie nʼobi ya, ma nwee ike ijide onwe ya, ka o si nʼenweghị mmanye ọbụla idebe nwaagbọghọ e kwuru na ọ ga-alụ na-enweghị mmekọ ọbụla, ọ bụ ihe dị mma ka o mere. 38Ya mere, onye ahụ lụrụ nwaagbọghọ o kwuru na ọ ga-alụ mere nke ọma, ma onye kpebikwara na ọ gaghị alụ mekwara nke ọma karịa.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.