Native Bible

1 Corinthians 7:15 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ma ọ bụrụ na onye ahụ nke na-ekweghị ekwe ekewapụ onwe ya, ya dịrị otu ahụ, nke a emeghị ka nwanna anyị nwoke maọbụ nwanna anyị nwanyị bụrụ ohu nʼọnọdụ dị otu a, nʼihi na Chineke kpọrọ anyị ka anyị bie ndụ udo.

1 Corinthians 7:15 in English

1 Corinthians 7:15 · Berean Standard Bible

But if the unbeliever leaves, let him go. The believing brother or sister is not bound in such cases. God has called you * to live in peace.

Context

13Ọ bụrụkwa na nwanyị kwere ekwe alụọ di nke na-ekweghị ekwe, ya agbarala di ya alụkwaghị m, ma ọ bụrụ na di ya chọrọ ịnọgide dịka di ya. 14Nʼihi na edoola di ahụ na-ekweghị ekwe nsọ site na nwunye ya, otu a kwa a na-edokwa nwunye ahụ na-ekweghị ekwe nsọ site na di ya, bụ onye kwere ekwe. Ọ bụrụ na ọ dịghị otu a, ụmụ unu ga-abụ ndị na-adịghị ọcha. Ma otu ọ dị, ha dị nsọ. 15Ma ọ bụrụ na onye ahụ nke na-ekweghị ekwe ekewapụ onwe ya, ya dịrị otu ahụ, nke a emeghị ka nwanna anyị nwoke maọbụ nwanna anyị nwanyị bụrụ ohu nʼọnọdụ dị otu a, nʼihi na Chineke kpọrọ anyị ka anyị bie ndụ udo. 16Gị nwunye, ị mara maọbụ gị ga-azọpụta di gị? Ma, gị bụ di, si aṅa mara maọbụ gị ga-azọpụta nwunye gị? 17Ka onye ọbụla bie ndụ ya dịka amara Onyenwe anyị nyere ya si dị, nakwa nʼọnọdụ nke Chineke kpọrọ ya. Nke a bụ iwu m na-enye nʼụlọ chọọchị niile.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.