1 Ndị Kọrint 5:9
1 Corinthians 5:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
E dere m unu nʼime akwụkwọ ozi m, ka unu na ndị na-akwa iko ghara inwe mmekọ ọbụla.
1 Corinthians 5:9 in English
1 Corinthians 5:9 · Berean Standard Bible
I wrote you in my letter not to associate with sexually immoral people.
Context
7Wepụnụ ihe nʼeko achịcha a nọ nʼetiti unu, ka unu bụrụ ndị dị ọhụrụ, na ndị dị ọcha. Nʼihi na a chụọlarị Kraịst, bụ aja nwa atụrụ, nke Ngabiga anyị. 8Nʼihi ya ka anyị mee mmemme a na-ejighị ihe na-eko achịcha nke bụ ihe ọjọọ na obi ọjọọ, kama ka anyị jiri achịcha na-ekoghị eko nke bụ obi ọcha na eziokwu. 9E dere m unu nʼime akwụkwọ ozi m, ka unu na ndị na-akwa iko ghara inwe mmekọ ọbụla. 10Ọ bụghị ihe gbasara ndị nke ụwa ndị na-akwa iko, maọbụ ndị anya ukwu, na ndị na-apụnara mmadụ ihe, maọbụ ndị na-ekpere arụsị. Ọ bụrụ otu a, ọ pụtara na unu ga-esi nʼụwa pụọ. 11Ma ugbu a, a na m edere unu ka unu na onye ọbụla nke na-akpọ onwe ya nwanna nwoke maọbụ nwanna nwanyị ghara imekọ ihe, ma ọ bụrụ na ọ na-ebi ndụ ịkwa iko, maọbụ nwee anya ukwu, maọbụ na-ekpere arụsị, onye na-ekwutọ ibe ya, onye na-aṅụbiga mmanya oke, maọbụ onye na-apụnara mmadụ ihe. Unu na ndị dị otu a erikọla nri.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.