1 Ndị Kọrint 4:15
1 Corinthians 4:15 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ bụ ezie na unu nwere ọtụtụ ndị nche, ma unu enweghị karịa otu nna. Nʼihi na ọ bụ m bụ nna unu nʼime Kraịst Jisọs, site nʼoziọma ahụ m wetaara unu.
1 Corinthians 4:15 in English
1 Corinthians 4:15 · Berean Standard Bible
Even if you have ten thousand guardians in Christ, you do not have many fathers; for in Christ Jesus I became your father through the gospel.
Context
13Anyị na-eji okwu dị nro na-azaghachi ndị na-ekwujọ anyị. Tutu ruo ugbu a, a na-emeso anyị mmeso dịka anyị bụ unyi ndị ụwa na-azachapụ, dịka ihe a jụrụ ajụ nʼanya ndị ụwa. 14Anaghị m edere unu ihe ndị a ka ihere mee unu, kama ana m ede ya ịdụ unu ọdụ, na ịdọ unu aka na ntị, dịka ụmụ m hụrụ nʼanya. 15Ọ bụ ezie na unu nwere ọtụtụ ndị nche, ma unu enweghị karịa otu nna. Nʼihi na ọ bụ m bụ nna unu nʼime Kraịst Jisọs, site nʼoziọma ahụ m wetaara unu. 16Ya mere, ana arịọ m unu, ka unu na-eṅomi ndụ m. 17Nʼihi nke a, ana m ezitere unu Timoti, bụ ezi nwa m onye m hụrụ nʼanya, nke kwesiri ntụkwasị obi nʼime Onyenwe anyị. Ọ ga-echetara unu otu m si e bi ndụ nʼime Onyenwe anyị Kraịst Jisọs, dịka m na-akụzi ya nʼebe niile na nzukọ niile.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.