1 Ndị Kọrint 3:14
1 Corinthians 3:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ bụrụ na ọkụ eruchapụghị ihe ọbụla mmadụ ji wuo ụlọ ya nʼelu ntọala ahụ, onye ahụ ga-anata ụgwọ ọrụ.
1 Corinthians 3:14 in English
1 Corinthians 3:14 · Berean Standard Bible
If what he has built survives, he will receive a reward.
Context
12Ma ọ bụrụ na mmadụ ọbụla na-eji ọlaedo maọbụ ọlaọcha, ma ọ bụkwanụ nkume dị oke ọnụahịa, osisi maọbụ okporo ọka, ma ọ bụkwanụ ahịhịa na-ewukwasị nʼelu ntọala ahụ, 13ọrụ onye ọbụla ga-egosipụta ihe ọ bụ, nʼihi na Ụbọchị ahụ ga-eme ka ọ pụta ìhè. A ga-eji ọkụ kpughee ya nʼihi na ọ bụ ọkụ ka a ga-eji nwapụta ụdị ọrụ ọ bụ mmadụ ọbụla rụrụ. 14Ọ bụrụ na ọkụ eruchapụghị ihe ọbụla mmadụ ji wuo ụlọ ya nʼelu ntọala ahụ, onye ahụ ga-anata ụgwọ ọrụ. 15Ma ọ bụrụ na ọkụ erechapụ ihe ọbụla mmadụ ji rụọ ọrụ ya, ọrụ ọ rụrụ ga-ala nʼiyi, ma a ga-azọpụta onye ahụ, ma ọ ga-adị ka a ga-asị na e si nʼụlọ na-ere ọkụ zọpụta ya. 16Ọ bụ na unu aghọtaghị na unu bụ ụlọnsọ na Mmụọ Nsọ Chineke bi nʼime unu?
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.