Native Bible

1 Corinthians 16:1 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼihe niile banyere ụtụ ihe onyinye nke ndị nsọ, gbalịanụ mee dịka m nyere ndị chọọchị dị nʼakụkụ Galeshịa nʼiwu.

1 Corinthians 16:1 in English

1 Corinthians 16:1 · Berean Standard Bible

Now about the collection for the saints, you are to do as I directed the churches of Galatia:

Context

1Nʼihe niile banyere ụtụ ihe onyinye nke ndị nsọ, gbalịanụ mee dịka m nyere ndị chọọchị dị nʼakụkụ Galeshịa nʼiwu. 2Ụbọchị ụka niile, ka onye ọbụla site nʼihe ọ kpatara nʼizu ụka ahụ wepụta ụfọdụ ihe nke ọ ga-eji nye onyinye a. Unu e cherekwala ịnakọta ihe onyinye ndị a ruo mgbe m ga-abịa. Ka a hapụ iche tutu ruo mgbe m bịara. 3Mgbe m bịara, aga m edenye ndị ahụ kwesiri ntụkwasị obi, bụ ndị unu họpụtara akwụkwọ nkọwa, ziga ha ibugara ndị nọ na Jerusalem onyinye obiọma unu.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.