1 Ndị Kọrint 15:52
1 Corinthians 15:52 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼotu mgbe, nʼotu ntabi anya, mgbe a ga-afụ opi ike ikpeazụ. Nʼihi na opi ga-ada, a ga-eme ka ndị nwụrụ anwụ si nʼọnwụ bilite na-ereghị ure. A ga-agbanwekwa anyị.
1 Corinthians 15:52 in English
1 Corinthians 15:52 · Berean Standard Bible
in an instant, in the twinkling of an eye, at the last trumpet. For the trumpet will sound, the dead will be raised imperishable, and we will be changed.
Context
50Ihe m na-ekwu, ụmụnna m, bụ na anụ ahụ na ọbara enweghị ike iketa alaeze Chineke. Ihe na-ere ure agaghịkwa eketa ereghị ure. 51Ma geenụ ntị ka m gwa unu ihe omimi a! Ọ bụghị anyị niile na-aga ịnwụ, kama, a ga-enye anyị anụ ahụ ọhụrụ nke pụrụ iche. 52Nʼotu mgbe, nʼotu ntabi anya, mgbe a ga-afụ opi ike ikpeazụ. Nʼihi na opi ga-ada, a ga-eme ka ndị nwụrụ anwụ si nʼọnwụ bilite na-ereghị ure. A ga-agbanwekwa anyị. 53Nʼihi na a ghaghị ịgbanwe anụ ahụ anyị a nke na-anwụ anwụ, nyekwa anyị ahụ nke na-agaghị anwụ ọzọ. 54Mgbe ahụ nke a pụrụ ire ure ga-eyikwasị ereghị ure, nke a pụrụ ịnwụ anwụ ga-eyikwasị anwụghị anwụ. Mgbe ahụ, okwu ahụ e dere nʼakwụkwọ nsọ ga-emezu, okwu ahụ sịrị, “Elomiela ọnwụ, meriekwa ike ya niile.”*
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.