1 Ndị Kọrint 15:26
1 Corinthians 15:26 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Onye iro ikpeazụ a ga-emeri bụ ọnwụ.
1 Corinthians 15:26 in English
1 Corinthians 15:26 · Berean Standard Bible
The last enemy to be destroyed is death.
Context
24Mgbe nke a gasịrị, ọgwụgwụ ihe niile ga-abịa, mgbe ọ ga-enyefe alaeze nʼaka Chineke bụ Nna, nʼihi na o meriela ịchị isi niile, na ikike niile na ike niile. 25Nʼihi na ọ ga-abụ eze tutu ruo mgbe ọ lụgburu ndị iro ya niile, doo ha nʼokpuru ụkwụ ya. 26Onye iro ikpeazụ a ga-emeri bụ ọnwụ. 27Nʼihi na “O doola ihe niile nʼokpuru ụkwụ ya.”* Ma mgbe ọbụla asịrị, “e doola ihe niile” nʼokpuru ụkwụ ya, o doro anya na Chineke agụnyeghị onwe ya, nʼihi na ọ bụ ya tinyere ihe niile nʼokpuru Kraịst. 28Mgbe e merela ka ihe niile nọrọ nʼokpuru ya, mgbe ahụ, Ọkpara ya nʼonwe ya, ga-edobe onwe ya nʼokpuru onye ahụ dobere ihe niile nʼokpuru ya, ka Chineke bụrụ onye na-achị ihe niile.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.