1 Ndị Kọrint 14:28
1 Corinthians 14:28 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ bụrụ na ọ dịghị onye ga-akọwa ihe ha na-asụ, ka onye ahụ na-asụ asụsụ dị iche na chọọchị mechie ọnụ ya. Ya na Chineke sụrịta ya.
1 Corinthians 14:28 in English
1 Corinthians 14:28 · Berean Standard Bible
But if there is no interpreter, he should remain silent in the church and speak only to himself and God.
Context
26Ugbu a, ụmụnna m, kedụ otu o kwesiri ịdị? Mgbe ọbụla unu zukọrọ, ụfọdụ kwesiri ịbụ abụ, onye ọzọ ga-ezi unu ihe; maọbụ gwa unu ozi dị mkpa e gosiri ya, maọbụ jiri asụsụ nke ọ na-amụghị gwa unu okwu, ka onye ọzọ kọwaa ihe onye ji asụsụ a dị iche kwuo okwu kwuru. Ma ka ihe ọbụla e mere nʼime ụlọ chọọchị bụrụ ihe ga-ewuli onye ọbụla elu. 27A sịkwa na ọ dị ndị chọrọ iji asụsụ dị iche kwuo okwu, ka mmadụ abụọ maọbụ atọ kwuo. Kama ka ha kwuo nʼotu nʼotu nʼusoro. Ka onye ga-akọwa ihe ha kwuru nọrọkwa nʼebe ahụ. 28Ọ bụrụ na ọ dịghị onye ga-akọwa ihe ha na-asụ, ka onye ahụ na-asụ asụsụ dị iche na chọọchị mechie ọnụ ya. Ya na Chineke sụrịta ya. 29Ka mmadụ abụọ maọbụ atọ nwere onyinye ibu amụma kwuo okwu nʼotu nʼotu, ka ndị ọzọ tulee ihe ha kwuru. 30Ọ bụrụ na-ekpughere onye ọzọ nọdụ nʼakụkụ ya ihe, ka onye mbụ mechie ọnụ ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.