1 Ndị Kọrint 14:11
1 Corinthians 14:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ bụrụ na m aghọtaghị ihe onye na-asụ otu nʼime asụsụ ndị a na-ekwu, aga m abụ ọbịa nʼebe onye na-asụ asụsụ ahụ nọ, ya onwe ya ga-abụkwa ọbịa nʼebe m nọ.
1 Corinthians 14:11 in English
1 Corinthians 14:11 · Berean Standard Bible
If, then, I do not know the meaning of someone’s language, I am a foreigner * to the speaker, and he is a foreigner to me.
Context
9Nʼotu aka ahụ kwa, ọ bụrụ na ị na-agwa mmadụ okwu nʼasụsụ ọ na-adịghị anụ, olee otu ọ ga-esi ghọta ihe ị na-ekwu? Nʼoge ahụ, ifufe ka unu na-agwa okwu. 10Asụsụ a na-asụ nʼụwa a dị ukwuu, ma ha niile bara uru nye ndị na-anụ ha. 11Ọ bụrụ na m aghọtaghị ihe onye na-asụ otu nʼime asụsụ ndị a na-ekwu, aga m abụ ọbịa nʼebe onye na-asụ asụsụ ahụ nọ, ya onwe ya ga-abụkwa ọbịa nʼebe m nọ. 12Ebe ọ na-agụ unu agụụ inweta onyinye nke Mmụọ Nsọ, chọọnụ onyinye ndị ahụ ga-enyere unu aka iwuli nzukọ elu. 13Onye ọbụla na-asụ asụsụ nʼolu dị iche iche, ga-ekpe ekpere ka e nye ya onyinye ịkọwa olu dị iche iche.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.