1 Ndị Kọrint 11:21
1 Corinthians 11:21 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼihi na mgbe unu na-eri nri, ụfọdụ nʼime unu na-eri nri anyasị nke aka ha. Nke mere, nʼotu onye na-anọ agụụ ebe onye ọzọ na-aṅụbigakwa mmanya oke.
1 Corinthians 11:21 in English
1 Corinthians 11:21 · Berean Standard Bible
For as you eat, each of you goes ahead without sharing his meal.* While one remains hungry, another gets drunk.
Context
19Nʼezie ụdị nkewa dị otu a aghaghị ịdị nʼetiti unu ka e nwee ike mara ndị Chineke nabatara. 20Mgbe unu zukọtara, ọ bụghị nri anyasị nke Onyenwe anyị ka unu na-eri. 21Nʼihi na mgbe unu na-eri nri, ụfọdụ nʼime unu na-eri nri anyasị nke aka ha. Nke mere, nʼotu onye na-anọ agụụ ebe onye ọzọ na-aṅụbigakwa mmanya oke. 22A ga-akpọ nke a gịnị? Ọ bụ na unu enweghị ụlọ ebe unu ga-anọ rijuo afọ ma ṅụjuokwa afọ? Ka ọ bụ na unu na-elelị nzukọ Chineke na emenye ndị na-enweghị ihe ihere? Gịnị ka m ga-agwa unu? Aga m eto unu maka nke a? Agaghị m eto unu maka nke a. 23Nʼihi na ihe m ziri unu bụ ihe Onyenwe anyị ziri m. Nʼabalị ụbọchị ahụ a rara ya nye, Onyenwe anyị Jisọs weere otu ogbe achịcha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.