1 Ndị Kọrint 11:16
1 Corinthians 11:16 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ bụrụ na onye ọbụla na-arụ ụka banyere omenaala nke a, anyị onwe anyị na nzukọ Chineke niile enweghị omenaala ọzọ banyere nke a.
1 Corinthians 11:16 in English
1 Corinthians 11:16 · Berean Standard Bible
If anyone is inclined to dispute this, we have no other practice, nor do the churches of God.
Context
14Unu matakwara nke ọma na ọ bụ ihe ihere na nwoke ga-ebu agịrị isi dị ogologo. 15Ma ọ bụrụ na nwanyị enwee agịrị isi dị ogologo ọ bụ ihe otuto nye ya nʼihi na e nyere ya agịrị isi dị ogologo ka ọ bụrụ ihe mkpuchi. 16Ọ bụrụ na onye ọbụla na-arụ ụka banyere omenaala nke a, anyị onwe anyị na nzukọ Chineke niile enweghị omenaala ọzọ banyere nke a. 17Nʼime ntụziaka ndị a, enweghị m otuto nye unu nʼihi na mgbe unu zukọtara omume unu na-eweta ihe ọjọọ karịa ihe ọma. 18Na mmalite, ihe m na-anụ bụ na mgbe niile unu zukọrọ dịka chọọchị, ịrụ ụka nke na-ebute nkewa na-adị nʼetiti unu. E kwenyekwara m na ụfọdụ ihe ndị a m nụrụ bụ eziokwu.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.