Native Bible

1 Corinthians 1:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Otu ihe si dị, ọ dịghị onyinye mmụọ fọdụrụ unu nke unu na-enweghị, ka unu nọrọ na-eche mgbe Chineke ga-egosipụta Onyenwe anyị Jisọs Kraịst.

1 Corinthians 1:7 in English

1 Corinthians 1:7 · Berean Standard Bible

Therefore you do not lack any spiritual gift as you eagerly await the revelation of our Lord Jesus Christ.

Context

5Nʼihi na e emeela ka unu baa ụba nʼụzọ niile, nʼime ya, ma nʼokwu unu ma na nghọta unu. O meekwala ka unu nwee nghọta zuru ezu banyere eziokwu niile. Ọ na-emekwa ka unu nwee ike na-ekwupụta okwu banyere oziọma ya. 6Nʼihi na ịgba akaebe banyere Kraịst pụtara ihe, guzosiekwa ike na ndụ unu. 7Otu ihe si dị, ọ dịghị onyinye mmụọ fọdụrụ unu nke unu na-enweghị, ka unu nọrọ na-eche mgbe Chineke ga-egosipụta Onyenwe anyị Jisọs Kraịst. 8Ọ ga-eme ka unu dị ike ruo na mgbe ikpeazụ, meekwa ka unu bụrụ ndị na-enweghị ịta ụta nʼụbọchị Onyenwe anyị Jisọs Kraịst. 9Chineke, onye kpọbatara unu ka unu na Ọkpara ya bụ Onyenwe anyị Jisọs Kraịst, na-enwe mmekọrịta kwesiri ntụkwasị obi.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.