1 Ndị Kọrint 1:25
1 Corinthians 1:25 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼihi na nzuzu Chineke dị mma karịa amamihe niile nke mmadụ, adịghị ike Chineke dịkwa ukwuu karịa ike niile nke mmadụ.
1 Corinthians 1:25 in English
1 Corinthians 1:25 · Berean Standard Bible
For the foolishness of God is wiser than man’s wisdom,* and the weakness of God is stronger than man’s strength.
Context
23Ma anyị onwe anyị na-ekwusa Kraịst, onye a kpọgburu nʼobe, onye bụ ihe mgbochi nʼebe ndị Juu nọ, ma na ntị ndị mba ọzọ, ọ dị ka okwu nzuzu. 24Ma nye ndị niile a kpọrọ, ma ndị Juu ma ndị Griik, Kraịst bụ ike nke Chineke bụrụkwa amamihe nke Chineke. 25Nʼihi na nzuzu Chineke dị mma karịa amamihe niile nke mmadụ, adịghị ike Chineke dịkwa ukwuu karịa ike niile nke mmadụ. 26Ụmụnna m, chetakwanụ ihe unu bụ mgbe a kpọrọ unu. Chetanụ na ọ bụ ole na ole nʼime unu bụ ndị maara ihe nʼusoro ogugo mmadụ, ndị dị ike, na ndị a maara aha ha nʼobodo. 27Ma lee na ọ bụ ihe ahụ ụwa gụrụ dịka ihe nzuzu, ka Chineke họrọ iji mee ka ihere mee ndị amamihe. Ọ bụkwa ihe ha gụrụ dịka ihe na-adịghị ike ka Chineke họọrọ iji mee ka ihere mee ndị dị ike.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.