1 Ndị Kọrint 1:20
1 Corinthians 1:20 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Olee ebe ndị oke amamihe nọ? Olee ebe ndị ode akwụkwọ nọ? Olee ebe ndị oke ịrụ ụka nke oge a nọ? Chineke o mebeghị ka amamihe nke ụwa a bụrụ ihe efu?
1 Corinthians 1:20 in English
1 Corinthians 1:20 · Berean Standard Bible
Where is the wise man? Where is the scribe? Where is the philosopher of this age? Has not God made foolish the wisdom of the world?
Context
18Nʼihi na okwu maka obe bụ ihe nzuzu nye ndị na-efu efu, ma nye anyị ndị a na-azọpụta, ọ bụrụ anyị ike nke Chineke. 19E dere ya,
“Aga m emebi amamihe ndị maara ihe.
Aga m emekwa ka oke nghọta nke ndị maara ihe bụrụ ihe efu.”* 20Olee ebe ndị oke amamihe nọ? Olee ebe ndị ode akwụkwọ nọ? Olee ebe ndị oke ịrụ ụka nke oge a nọ? Chineke o mebeghị ka amamihe nke ụwa a bụrụ ihe efu? 21Ma ebe ọ bụ site nʼamamihe nke Chineke, ụwa enweghị ike ịmata Chineke site na amamihe nke ya, ọ dị Chineke ezi mma isite nʼoziọma nke a na-ekwusa nke ndị mmadụ na-akpọ ihe nzuzu zọpụta ndị kweere. 22Ndị Juu chọrọ ịhụ ihe ịrịbama, ndị Griik na-achọkwa amamihe.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.