Native Bible

1 Chronicles 9:26 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ma ndịisi nche ọnụ ụzọ ama anọ ndị ahụ bụ ndị Livayị ka esitere nʼịtụkwasị obi nyefee ọrụ ilekọta ime ụlọ niile nakwa ụlọakụ niile dị nʼime ụlọ Chineke nʼaka.

1 Chronicles 9:26 in English

1 Chronicles 9:26 · Berean Standard Bible

But the four chief gatekeepers, who were Levites, were entrusted with the rooms and the treasuries of the house of God.

Context

24Ha na-eche akụkụ anọ ya niile, ọwụwa anyanwụ, ọdịda anyanwụ, ugwu na ndịda. 25Ụbọchị asaa ka ha na-anọ nʼọrụ a. Emesịa, ụmụnna ha na-abịa gbanwee ha. Ya mere, ha na-agbanwe onwe ha ụbọchị asaa asaa. 26Ma ndịisi nche ọnụ ụzọ ama anọ ndị ahụ bụ ndị Livayị ka esitere nʼịtụkwasị obi nyefee ọrụ ilekọta ime ụlọ niile nakwa ụlọakụ niile dị nʼime ụlọ Chineke nʼaka. 27Ha na-eche nche gburugburu ụlọnsọ Chineke abalị niile, nʼihi na ọ bụ ha ka ọ dị nʼaka iche ya nche. Ọ bụkwa ha ka e nyefere ọrụ imeghe ya ụtụtụ niile. 28Ụfọdụ nʼime ha ka ọ dị nʼaka ilekọta ngwongwo e ji achụ aja. Ha na-agụ ya ọnụ mgbe ọbụla e webatara ya, na mgbe ọbụla a na-ewepụ ya.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.