Native Bible

1 Chronicles 9:22 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọnụọgụgụ ndị na-eche ọnụ ụzọ nche nʼoge ahụ bụ narị abụọ na iri na abụọ (212). E depụtara aha ha nʼakwụkwọ usoro ọmụmụ nke obodo nta ha. Ndị nche ọnụ ụzọ ama ndị a bụ ndị Devid na Samuel onye amụma họpụtara nye ha ọnọdụ a nʼihi na-atụkwasịrị ha obi.

1 Chronicles 9:22 in English

1 Chronicles 9:22 · Berean Standard Bible

The number of those chosen to be gatekeepers at the thresholds was 212. They were registered by genealogy in their villages. David and Samuel the seer had appointed them to their positions of trust.

Context

20Finehaz nwa Elieza bụ onyeisi ndị mbụ rụrụ ọrụ a na mgbe ochie, Onyenwe anyị nọnyekwaara ya. 21Mgbe ahụ, Zekaraya nwa Meshelemaia bụ onye na-elekọta ọnụ ụzọ e si abata nʼime ụlọ ikwu. 22Ọnụọgụgụ ndị na-eche ọnụ ụzọ nche nʼoge ahụ bụ narị abụọ na iri na abụọ (212). E depụtara aha ha nʼakwụkwọ usoro ọmụmụ nke obodo nta ha. Ndị nche ọnụ ụzọ ama ndị a bụ ndị Devid na Samuel onye amụma họpụtara nye ha ọnọdụ a nʼihi na-atụkwasịrị ha obi. 23Ha na ụmụ ụmụ ha ka e tinyere ya nʼaka iche ụlọ nzute Onyenwe anyị nche. 24Ha na-eche akụkụ anọ ya niile, ọwụwa anyanwụ, ọdịda anyanwụ, ugwu na ndịda.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.