1 Ihe E Mere 29:28
1 Chronicles 29:28 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ nwụrụ mgbe ọ ghọrọ ezigbo agadi. Ọ bụkwa onye biri ogologo ndụ, onye nwekwara akụnụba na nsọpụrụ. Solomọn nwa ya nwoke nọchiri ya dịka eze.
1 Chronicles 29:28 in English
1 Chronicles 29:28 · Berean Standard Bible
He died at a ripe old age, full of years, riches, and honor, and his son Solomon reigned in his place.
Context
26Devid nwa Jesi bụ eze ndị Izrel niile. 27Ọ chịrị Izrel iri afọ anọ. Ọ chịrị afọ asaa na Hebrọn, chịakwa iri afọ atọ na atọ na Jerusalem. 28Ọ nwụrụ mgbe ọ ghọrọ ezigbo agadi. Ọ bụkwa onye biri ogologo ndụ, onye nwekwara akụnụba na nsọpụrụ. Solomọn nwa ya nwoke nọchiri ya dịka eze. 29Ihe niile gbasara ọchịchị eze Devid, site na mmalite rụọ nʼọgwụgwụ, ka e dere nʼakwụkwọ akụkọ Samuel, onye ọhụ ụzọ, na nʼakwụkwọ Netan, onye amụma, na nʼakwụkwọ Gad onye ọhụ ụzọ. 30Akụkọ ndị a gosiri ihe gbasara ọchịchị eze ya, na ịdị ike ya, na ihe niile mere ya, na ihe mere ndị Izrel, na ndị eze ndị mba ọzọ bi ha gburugburu.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.